Native Bible

Proverbs 18:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.

Proverbs 18:11 in English

Proverbs 18:11 · Berean Standard Bible

A rich man’s wealth is his fortified city; it is like a high wall in his imagination.

Context

9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi. 10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ. 11Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha. 12Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ. 13Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.