Ilu 18:19
Proverbs 18:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
Proverbs 18:19 in English
Proverbs 18:19 · Berean Standard Bible
An offended brother is harder to win than a fortified city, and disputes are like the bars of a castle.
Context
17Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,
tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ. 18Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ
dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu. 19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.
Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie. 20Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.
Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ. 21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.
Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.