Native Bible

Proverbs 18:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.

Proverbs 18:17 in English

Proverbs 18:17 · Berean Standard Bible

The first to state his case seems right until another comes and cross-examines him.

Context

15Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya. 16Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu. 17Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ. 18Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu. 19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.