Native Bible

Ecclesiastes 7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Ekiliziastis 7
1Ezi aha* ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.* Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma. 2Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi. 3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka 4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ. 5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ. 6Ọchị onye nzuzu dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.* Ihe a bụkwa ihe efu. 7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ. 8Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako! 9Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu. 10Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a. 11Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma. Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya. 12Amamihe bụ ndo dịka ego si bụrụkwa ndo, ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a: Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya. 13Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme. Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie, bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ? 14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta ọdịnihu ya. 15Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a; onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya, ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya. 16Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke, emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke. Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị? 17Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke, abụkwala onye nzuzu! Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị? 18Ọ dị mma ijide otu na-esepụghị aka na nke ọzọ, onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ. 19Amamihe na-eme ka otu onye dị ike karịa mmadụ iri na-achị otu obodo. 20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla. 21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị. 22Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ. 23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, “Aga m abụ onye amamihe,” ma nke a karịrị m. 24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya? 25A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche. 26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya. 27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile. 28Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha. 29Achọpụtara m naanị nke a, Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi, ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.” 7:1 Ilu 22:1 7:1 Maọbụ, mmanụ oke ọnụahịa 7:6 Mgbe ogwu na-ere ọkụ, na-eme mkpọtụ, na-asụkwa anwụrụ, nke a adịghị eme ka ahụ ndị na anya ọkụ ya nʼoge oyi kporo ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.