Ekiliziastis 7:20
Ecclesiastes 7:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
Ecclesiastes 7:20 in English
Ecclesiastes 7:20 · Berean Standard Bible
Surely there is no righteous man on earth who does good and never sins.
Context
18Ọ dị mma ijide otu
na-esepụghị aka na nke ọzọ,
onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ. 19Amamihe na-eme ka otu onye dị ike
karịa mmadụ iri na-achị otu obodo. 20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume,
ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla. 21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu,
ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị. 22Gị onwe gị maara
na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.