Native Bible

Ecclesiastes 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amamihe na-eme ka otu onye dị ike karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.

Ecclesiastes 7:19 in English

Ecclesiastes 7:19 · Berean Standard Bible

Wisdom makes the wise man stronger than ten rulers in a city.

Context

17Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke, abụkwala onye nzuzu! Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị? 18Ọ dị mma ijide otu na-esepụghị aka na nke ọzọ, onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ. 19Amamihe na-eme ka otu onye dị ike karịa mmadụ iri na-achị otu obodo. 20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla. 21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.