Ekiliziastis 7:21
Ecclesiastes 7:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.
Ecclesiastes 7:21 in English
Ecclesiastes 7:21 · Berean Standard Bible
Do not pay attention to every word that is spoken, or you may hear your servant cursing you.
Context
19Amamihe na-eme ka otu onye dị ike
karịa mmadụ iri na-achị otu obodo. 20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume,
ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla. 21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu,
ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị. 22Gị onwe gị maara
na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ. 23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị,
“Aga m abụ onye amamihe,”
ma nke a karịrị m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.