Native Bible

Ecclesiastes 7:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.

Ecclesiastes 7:22 in English

Ecclesiastes 7:22 · Berean Standard Bible

For you know in your heart that many times you yourself have cursed others.

Context

20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla. 21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị. 22Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ. 23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, “Aga m abụ onye amamihe,” ma nke a karịrị m. 24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.