Ekiliziastis 7:27
Ecclesiastes 7:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.
Ecclesiastes 7:27 in English
Ecclesiastes 7:27 · Berean Standard Bible
“Behold,” says the Teacher, “I have discovered this by adding one thing to another to find an explanation.
Context
25A tụgharịrị uche m ka m ghọta,
iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị
na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume
na ịyị ara nke dị na enweghị uche. 26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ,
ihe ahụ bụ nwanyị.
Obi ya dị ka ụgbụ.
Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe.
Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ,
ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya. 27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru:
“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile. 28Mgbe m ka na-achọ
ma achọtaghị m,
nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha,
ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha. 29Achọpụtara m naanị nke a,
Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi,
ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”
7:1 Ilu 22:1
7:1 Maọbụ, mmanụ oke ọnụahịa
7:6 Mgbe ogwu na-ere ọkụ, na-eme mkpọtụ, na-asụkwa anwụrụ, nke a adịghị eme ka ahụ ndị na anya ọkụ ya nʼoge oyi kporo ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.