Ekiliziastis 7:25
Ecclesiastes 7:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche.
Ecclesiastes 7:25 in English
Ecclesiastes 7:25 · Berean Standard Bible
I directed my mind to understand, to explore, to search out wisdom and explanations, and to understand the stupidity of wickedness and the folly of madness.
Context
23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị,
“Aga m abụ onye amamihe,”
ma nke a karịrị m. 24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu;
ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya? 25A tụgharịrị uche m ka m ghọta,
iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị
na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume
na ịyị ara nke dị na enweghị uche. 26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ,
ihe ahụ bụ nwanyị.
Obi ya dị ka ụgbụ.
Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe.
Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ,
ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya. 27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru:
“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.