Native Bible

Ecclesiastes 7:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.

Ecclesiastes 7:26 in English

Ecclesiastes 7:26 · Berean Standard Bible

And I find more bitter than death the woman who is a snare, whose heart is a net, and whose hands are chains. The man who pleases God escapes her, but the sinner is ensnared.

Context

24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya? 25A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche. 26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya. 27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile. 28Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.