Ekiliziastis 7:26
Ecclesiastes 7:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.
Ecclesiastes 7:26 in English
Ecclesiastes 7:26 · Berean Standard Bible
And I find more bitter than death the woman who is a snare, whose heart is a net, and whose hands are chains. The man who pleases God escapes her, but the sinner is ensnared.
Context
24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu;
ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya? 25A tụgharịrị uche m ka m ghọta,
iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị
na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume
na ịyị ara nke dị na enweghị uche. 26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ,
ihe ahụ bụ nwanyị.
Obi ya dị ka ụgbụ.
Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe.
Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ,
ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya. 27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru:
“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile. 28Mgbe m ka na-achọ
ma achọtaghị m,
nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha,
ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.