Native Bible

Ecclesiastes 7:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.

Ecclesiastes 7:28 in English

Ecclesiastes 7:28 · Berean Standard Bible

While my soul was still searching but not finding, among a thousand I have found one upright man, but among all these I have not found one such woman.

Context

26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya. 27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile. 28Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha. 29Achọpụtara m naanị nke a, Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi, ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.” 7:1 Ilu 22:1 7:1 Maọbụ, mmanụ oke ọnụahịa 7:6 Mgbe ogwu na-ere ọkụ, na-eme mkpọtụ, na-asụkwa anwụrụ, nke a adịghị eme ka ahụ ndị na anya ọkụ ya nʼoge oyi kporo ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.