Native Bible

Ecclesiastes 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!

Ecclesiastes 7:8 in English

Ecclesiastes 7:8 · Berean Standard Bible

The end of a matter is better than the beginning, and a patient spirit is better than a proud one.

Context

6Ọchị onye nzuzu dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.* Ihe a bụkwa ihe efu. 7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ. 8Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako! 9Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu. 10Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.