Ekiliziastis 7:6
Ecclesiastes 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọchị onye nzuzu dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.* Ihe a bụkwa ihe efu.
Ecclesiastes 7:6 in English
Ecclesiastes 7:6 · Berean Standard Bible
For like the crackling of thorns under the pot, so is the laughter of the fool. This too is futile.
Context
4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ,
ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ. 5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe
karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ. 6Ọchị onye nzuzu
dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.*
Ihe a bụkwa ihe efu. 7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu,
iri ngarị na-emerụ obi mmadụ. 8Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya!
Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.