Native Bible

Ecclesiastes 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka

Ecclesiastes 7:3 in English

Ecclesiastes 7:3 · Berean Standard Bible

Sorrow is better than laughter, for a sad countenance is good for the heart.

Context

1Ezi aha* ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.* Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma. 2Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi. 3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka 4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ. 5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.