Ekiliziastis 7:3
Ecclesiastes 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka
Ecclesiastes 7:3 in English
Ecclesiastes 7:3 · Berean Standard Bible
Sorrow is better than laughter, for a sad countenance is good for the heart.
Context
1Ezi aha* ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.*
Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma. 2Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ
karịa ebe a na-eri na-aṅụ.
Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla;
ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi. 3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma,
ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka 4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ,
ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ. 5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe
karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.