Native Bible

Ecclesiastes 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.

Ecclesiastes 7:2 in English

Ecclesiastes 7:2 · Berean Standard Bible

It is better to enter a house of mourning than a house of feasting, since death is the end of every man, and the living should take this to heart.

Context

1Ezi aha* ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.* Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma. 2Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi. 3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka 4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.