Ekiliziastis 7:15
Ecclesiastes 7:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a; onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya, ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.
Ecclesiastes 7:15 in English
Ecclesiastes 7:15 · Berean Standard Bible
In my futile life I have seen both of these: A righteous man perishing in his righteousness, and a wicked man living long in his wickedness.
Context
13Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme.
Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie,
bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ? 14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma,
ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma
na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma
makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ.
Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta
ọdịnihu ya. 15Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a;
onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya,
ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya. 16Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke,
emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke.
Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị? 17Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke,
abụkwala onye nzuzu!
Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.