Ekiliziastis 7:16
Ecclesiastes 7:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke, emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke. Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?
Ecclesiastes 7:16 in English
Ecclesiastes 7:16 · Berean Standard Bible
Do not be overly righteous, and do not make yourself too wise. Why should you destroy yourself?
Context
14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma,
ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma
na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma
makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ.
Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta
ọdịnihu ya. 15Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a;
onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya,
ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya. 16Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke,
emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke.
Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị? 17Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke,
abụkwala onye nzuzu!
Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị? 18Ọ dị mma ijide otu
na-esepụghị aka na nke ọzọ,
onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.