Native Bible

1 Chronicles 24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to 1 Ihe E Mere 24
1Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama. 2Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja. 3Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a. 4Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ. 5E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama. 6Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ. 7Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya 8nke atọ, Harim nke anọ, Seorim 9nke ise, Malkija nke isii, Mijamin 10nke asaa, Hakoz nke asatọ, Abija 11nke itoolu, Jeshua nke iri, Shekanaya 12nke iri na otu, Eliashib nke iri na abụọ, Jakim 13nke iri na atọ, Hupa nke iri na anọ, Jeshebeab 14nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea 15nke iri na asaa, Hezia nke iri na asatọ, Hapizez 16nke iri na itoolu, Petahaya nke iri abụọ, Jehezkel 17nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul 18nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya. 19Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu. 20Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia. 21Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya. 22Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat. 23Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya. 24A họpụtara Maịka nwa Uziel, sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia. 25A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya. 26Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia. 27Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri. 28Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke. 29Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel. 30Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị. 31Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.