1 Ihe E Mere 24:2
1 Chronicles 24:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
1 Chronicles 24:2 in English
1 Chronicles 24:2 · Berean Standard Bible
But Nadab and Abihu died before their father did, and they had no sons; so Eleazar and Ithamar served as priests.
Context
1Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha:
Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama. 2Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja. 3Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a. 4Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.