Native Bible

1 Chronicles 24:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.

1 Chronicles 24:21 in English

1 Chronicles 24:21 · Berean Standard Bible

As for Rehabiah, from his sons: The first was Isshiah.*

Context

19Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu. 20Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia. 21Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya. 22Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat. 23Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.