Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Job 13
1“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile, ntị m anụla ma ghọtakwa ha. 2Mụ onwe m makwa ihe unu maara; abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ. 3Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu, ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m. 4Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru. 5Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe. 6Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m; geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta. 7Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide? Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya? 8Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe? Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke? 9Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu? Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ? 10Ọ ghaghị ịbara unu mba ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka. 11Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji? Egwu ya ọ dịghị atụ unu? 12Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ; okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ. 13“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu; ihe ọ pụtara ya pụta. 14Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu, werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m? 15A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m. Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha. 16Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya. 17Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m. Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị. 18Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro, amatala m na ikpe agaghị ama m. 19Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo*? Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ. 20“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị. 21Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ. Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji. 22Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị. Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m. 23Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere? Gosi m ajọ omume m na mmehie m. 24Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?* Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị? 25Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ? Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ? 26Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m, na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m. 27Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ; na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ. 28“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere, na dịka akwa nke nla riri. 13:19 Aịz 50:8 13:24 Abụ 13:1

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.