Job 13:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m; geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.
Job 13:6 in English
Job 13:6 · Berean Standard Bible
Hear now my argument, and listen to the plea of my lips.
Context
4Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;
unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru. 5Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,
nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe. 6Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;
geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta. 7Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?
Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya? 8Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?
Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.