Job 13:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu, ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.
Job 13:3 in English
Job 13:3 · Berean Standard Bible
Yet I desire to speak to the Almighty and argue my case before God.
Context
1“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,
ntị m anụla ma ghọtakwa ha. 2Mụ onwe m makwa ihe unu maara;
abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ. 3Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,
ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m. 4Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;
unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru. 5Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,
nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.