Job 13:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ? Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?
Job 13:25 in English
Job 13:25 · Berean Standard Bible
Would You frighten a windblown leaf? Would You chase after dry chaff?
Context
23Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?
Gosi m ajọ omume m na mmehie m. 24Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?*
Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị? 25Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?
Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ? 26Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,
na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m. 27Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;
na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile
site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.