Abụ Ọma 73
Psalms 73 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,
dịkwara ndị obi ha dị ọcha. 2Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ,
ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ. 3Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo*;
mgbe m hụrụ ịba ụba* nke ndị ajọ omume.* 4Ha anaghị adọgbu onwe ha;
ahụ ha gbara abụba, siekwa ike. 5Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha.
Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere. 6Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha;
ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe. 7Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta;
echiche ọjọọ ha enweghị ngụta. 8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu;
nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ. 9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha,
ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha. 10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha,
na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri. 11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara?
Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?” 12Otu a ka ndị ajọ omume dị,
ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa. 13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha,
nʼefu ka m kwọrọ aka* m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ. 14Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu;
ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ. 15Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,”
agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị. 16Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile,
ọ ghọọrọ m ihe mwute, 17tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke;
mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ. 18Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị;
ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi. 19Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya,
bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam! 20Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta,
otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara,
ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu. 21Mgbe m nọ nʼobi mwute;
mmụọ m dara mba. 22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe.
Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị. 23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile;
ị na-ejide m nʼaka nri m. 24Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,
ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị. 25Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị?
Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị. 26Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,
ma Chineke bụ ike nke obi m,
na ihe nketa m ruo ebighị ebi. 27Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi.
Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi. 28Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso.
Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m.
Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
73:3 Abụ 37:1,7; Ilu 23:17
73:3 Maọbụ, udo
73:3 Job 21:5-16; Jer 12:1
73:13 Biri ndụ na-enweghị ntụpọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.