Abụ Ọma 73:9
Psalms 73:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
Psalms 73:9 in English
Psalms 73:9 · Berean Standard Bible
They set their mouths against the heavens, and their tongues strut across the earth.
Context
7Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta;
echiche ọjọọ ha enweghị ngụta. 8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu;
nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ. 9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha,
ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha. 10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha,
na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri. 11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara?
Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.