Native Bible

Psalms 73:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”

Psalms 73:11 in English

Psalms 73:11 · Berean Standard Bible

The wicked say, “How can God know? Does the Most High have knowledge?”

Context

9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha. 10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri. 11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?” 12Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa. 13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka* m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.