Native Bible

Psalms 73:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka* m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.

Psalms 73:13 in English

Psalms 73:13 · Berean Standard Bible

Surely in vain I have kept my heart pure; in innocence I have washed my hands.

Context

11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?” 12Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa. 13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka* m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ. 14Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ. 15Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.