Native Bible

Psalms 73:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.

Psalms 73:15 in English

Psalms 73:15 · Berean Standard Bible

If I had said, “I will speak this way,” then I would have betrayed Your children.

Context

13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka* m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ. 14Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ. 15Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị. 16Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute, 17tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.