Abụ Ọma 73:3
Psalms 73:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo*; mgbe m hụrụ ịba ụba* nke ndị ajọ omume.*
Psalms 73:3 in English
Psalms 73:3 · Berean Standard Bible
For I envied the arrogant when I saw the prosperity of the wicked.
Context
1Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,
dịkwara ndị obi ha dị ọcha. 2Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ,
ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ. 3Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo*;
mgbe m hụrụ ịba ụba* nke ndị ajọ omume.* 4Ha anaghị adọgbu onwe ha;
ahụ ha gbara abụba, siekwa ike. 5Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha.
Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.