Abụ Ọma 73:23
Psalms 73:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
Psalms 73:23 in English
Psalms 73:23 · Berean Standard Bible
Yet I am always with You; You hold my right hand.
Context
21Mgbe m nọ nʼobi mwute;
mmụọ m dara mba. 22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe.
Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị. 23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile;
ị na-ejide m nʼaka nri m. 24Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,
ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị. 25Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị?
Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.