Native Bible

Psalms 72 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 72
1O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume. 4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu. 5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide, dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile. 6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala. 7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa. 8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu.* ruo na nsọtụ niile nke ụwa* 9Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya, ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala. 10Ndị eze Tashish* na mba niile dị nʼebe dị anya, ga-atụ ụtụ wetara ya; e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba,* ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye. 11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi. 12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka. 13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ. 14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya. 15Ka ọ dị ogologo ndụ! Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile. 16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa. 17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi. 18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche. 19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya. Amen na Amen. 20Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi. 72:8 Nke a na-ekwu banyere osimiri Yufretis. Mgbe Solomọn na-achị, ọ bụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Izrel ka ọ dị. Ọ bụ otu ihe e kwere ndị Izrel na nkwa mgbe ha si nʼọnọdụ ohu na-ahapụ Ijipt. Ọpụ 23:31; Zek 9:10 72:8 Ọ bụ site nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼosimiri Nwụrụ anwụ, ka a maara dị ka nsọtụ ụwa nʼoge ahụ. 72:10 Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21 72:10 Ala Sheba dị nʼArebịa, ebe ala Seba dị nʼAfrika.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.