Abụ Ọma 72:14
Psalms 72:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.
Psalms 72:14 in English
Psalms 72:14 · Berean Standard Bible
He will redeem them from oppression and violence, for their blood is precious in his sight.
Context
12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.
Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka. 13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,
ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ. 14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,
nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya. 15Ka ọ dị ogologo ndụ!
Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.
Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,
ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile. 16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.
Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;
ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.