Abụ Ọma 72:15
Psalms 72:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ọ dị ogologo ndụ! Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.
Psalms 72:15 in English
Psalms 72:15 · Berean Standard Bible
Long may he live! May gold from Sheba be given him. May people ever pray for him; may they bless him all day long.
Context
13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,
ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ. 14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,
nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya. 15Ka ọ dị ogologo ndụ!
Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.
Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,
ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile. 16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.
Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;
ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa. 17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.
A ga-esite na ya gọzie mba niile,
a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.