Native Bible

Psalms 72:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.

Psalms 72:17 in English

Psalms 72:17 · Berean Standard Bible

May his name endure forever; may his name continue* as long as the sun shines. In him may all nations be blessed; may they call him blessed.

Context

15Ka ọ dị ogologo ndụ! Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile. 16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa. 17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi. 18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche. 19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya. Amen na Amen.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.