Abụ Ọma 72:17
Psalms 72:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
Psalms 72:17 in English
Psalms 72:17 · Berean Standard Bible
May his name endure forever; may his name continue* as long as the sun shines. In him may all nations be blessed; may they call him blessed.
Context
15Ka ọ dị ogologo ndụ!
Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.
Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,
ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile. 16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.
Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;
ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa. 17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.
A ga-esite na ya gọzie mba niile,
a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi. 18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,
onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche. 19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;
ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.
Amen na Amen.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.