Abụ Ọma 72:18
Psalms 72:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.
Psalms 72:18 in English
Psalms 72:18 · Berean Standard Bible
Blessed be the LORD God, the God of Israel, who alone does marvelous deeds.
Context
16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.
Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;
ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa. 17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.
A ga-esite na ya gọzie mba niile,
a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi. 18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,
onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche. 19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;
ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.
Amen na Amen. 20Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.
72:8 Nke a na-ekwu banyere osimiri Yufretis. Mgbe Solomọn na-achị, ọ bụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Izrel ka ọ dị. Ọ bụ otu ihe e kwere ndị Izrel na nkwa mgbe ha si nʼọnọdụ ohu na-ahapụ Ijipt. Ọpụ 23:31; Zek 9:10
72:8 Ọ bụ site nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼosimiri Nwụrụ anwụ, ka a maara dị ka nsọtụ ụwa nʼoge ahụ.
72:10 Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21
72:10 Ala Sheba dị nʼArebịa, ebe ala Seba dị nʼAfrika.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.