Abụ Ọma 72:4
Psalms 72:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu.
Psalms 72:4 in English
Psalms 72:4 · Berean Standard Bible
May he vindicate the afflicted among the people; may he save the children of the needy and crush the oppressor.
Context
2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,
jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;
ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume. 4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,
zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;
ọ ga-egwepịa onye mmegbu. 5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,
dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile. 6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,
dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.