Abụ Ọma 72:6
Psalms 72:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
Psalms 72:6 in English
Psalms 72:6 · Berean Standard Bible
May he be like rain that falls on freshly cut grass, like spring showers that water the earth.
Context
4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,
zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;
ọ ga-egwepịa onye mmegbu. 5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,
dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile. 6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,
dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala. 7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;
ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa. 8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,
na-esite nʼiyi ukwu.* ruo na nsọtụ niile nke ụwa*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.