Abụ Ọma 72:3
Psalms 72:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
Psalms 72:3 in English
Psalms 72:3 · Berean Standard Bible
May the mountains bring peace to the people, and the hills bring righteousness.
Context
1O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.
Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,
jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;
ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume. 4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,
zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;
ọ ga-egwepịa onye mmegbu. 5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,
dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.