Abụ Ọma 71
Psalms 71 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ;
ekwela ka ihere mee m. 2Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m;
tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m. 3Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,
ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla;
nye iwu maka nzọpụta m,
nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike. 4O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ,
ndị afọ tara mmiri, gbapụta m. 5Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị,
ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.* 6Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m;
gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m.
Aga m anọgide na-eto gị. 7Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ,
ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike. 8Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,
ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile. 9Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi;
ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m. 10Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m;
ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo. 11Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ;
chụọ ya ọsọ, jidekwa ya,
nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.” 12O Chineke, anọla m ebe dị anya;
O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka. 13Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha;
ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi
ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ. 14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;
aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ. 15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị
na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,
ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. 16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,
aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. 17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,
ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile. 18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,
mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,
tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,
na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu. 19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,
gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.
O Chineke, onye dị ka gị? 20Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu
nke dị ilu,
ị ga-atụte ndụ m ọzọ;
site nʼebe dị omimi nke ụwa,
ị ga-adọkpụpụta m ọzọ. 21Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.
Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ. 22O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị,
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị;
aga m eji une bụkuo gị abụ otuto,
gị Onye nsọ nke Izrel. 23Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ
mgbe m na-abụku gị abụ otuto,
mụ, onye ị gbapụtara. 24Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta
ọrụ ezi omume gị niile,
nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ,
ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.
71:5 Jer 14:8; Jer 17:7,13
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.