Abụ Ọma 71:17
Psalms 71:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
Psalms 71:17 in English
Psalms 71:17 · Berean Standard Bible
O God, You have taught me from my youth, and to this day I proclaim Your marvelous deeds.
Context
15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị
na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,
ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. 16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,
aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. 17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,
ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile. 18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,
mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,
tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,
na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu. 19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,
gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.
O Chineke, onye dị ka gị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.