Native Bible

Psalms 71:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.

Psalms 71:15 in English

Psalms 71:15 · Berean Standard Bible

My mouth will declare Your righteousness and Your salvation all day long, though I cannot know their full measure.

Context

13Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ. 14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ. 15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. 16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. 17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.