Abụ Ọma 71:15
Psalms 71:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.
Psalms 71:15 in English
Psalms 71:15 · Berean Standard Bible
My mouth will declare Your righteousness and Your salvation all day long, though I cannot know their full measure.
Context
13Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha;
ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi
ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ. 14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;
aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ. 15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị
na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,
ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. 16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,
aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. 17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,
ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.