Abụ Ọma 71:16
Psalms 71:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.
Psalms 71:16 in English
Psalms 71:16 · Berean Standard Bible
I will enter in the strength of the Lord GOD; I will proclaim Your righteousness—Yours alone.
Context
14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;
aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ. 15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị
na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,
ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. 16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,
aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. 17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,
ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile. 18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,
mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,
tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,
na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.