Abụ Ọma 71:13
Psalms 71:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.
Psalms 71:13 in English
Psalms 71:13 · Berean Standard Bible
May the accusers of my soul be ashamed and consumed; may those who seek my harm be covered with scorn and disgrace.
Context
11Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ;
chụọ ya ọsọ, jidekwa ya,
nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.” 12O Chineke, anọla m ebe dị anya;
O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka. 13Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha;
ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi
ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ. 14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;
aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ. 15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị
na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,
ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.