Abụ Ọma 71:19
Psalms 71:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O Chineke, onye dị ka gị?
Psalms 71:19 in English
Psalms 71:19 · Berean Standard Bible
Your righteousness reaches to the heavens, O God, You who have done great things. Who, O God, is like You?
Context
17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,
ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile. 18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,
mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,
tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,
na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu. 19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,
gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.
O Chineke, onye dị ka gị? 20Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu
nke dị ilu,
ị ga-atụte ndụ m ọzọ;
site nʼebe dị omimi nke ụwa,
ị ga-adọkpụpụta m ọzọ. 21Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.
Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.