Abụ Ọma 71:21
Psalms 71:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
Psalms 71:21 in English
Psalms 71:21 · Berean Standard Bible
You will increase my honor and comfort me once again.
Context
19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,
gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.
O Chineke, onye dị ka gị? 20Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu
nke dị ilu,
ị ga-atụte ndụ m ọzọ;
site nʼebe dị omimi nke ụwa,
ị ga-adọkpụpụta m ọzọ. 21Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.
Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ. 22O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị,
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị;
aga m eji une bụkuo gị abụ otuto,
gị Onye nsọ nke Izrel. 23Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ
mgbe m na-abụku gị abụ otuto,
mụ, onye ị gbapụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.