Abụ Ọma 71:20
Psalms 71:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.
Psalms 71:20 in English
Psalms 71:20 · Berean Standard Bible
Though You have shown me many troubles and misfortunes, You will revive me once again. Even from the depths of the earth You will bring me back up.
Context
18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,
mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,
tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,
na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu. 19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,
gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.
O Chineke, onye dị ka gị? 20Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu
nke dị ilu,
ị ga-atụte ndụ m ọzọ;
site nʼebe dị omimi nke ụwa,
ị ga-adọkpụpụta m ọzọ. 21Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.
Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ. 22O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị,
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị;
aga m eji une bụkuo gị abụ otuto,
gị Onye nsọ nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.