Native Bible

Psalms 70 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 70
1O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka. 2Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere. 3Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha. 4Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.” 5Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.