Native Bible

Psalms 70:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.

Psalms 70:2 in English

Psalms 70:2 · Berean Standard Bible

May those who seek my life be ashamed and confounded; may those who wish me harm be repelled and humiliated.

Context

1O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka. 2Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere. 3Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha. 4Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.